Publicidade

Filhos

Por Bíblia Online

Os filhos são herança do Senhor — bênção e responsabilidade sagrada. A Bíblia orienta sobre a criação dos filhos com amor, disciplina e instrução nos caminhos de Deus.

Herança do Senhor

Os filhos são herança do Senhor e o fruto do ventre é seu galardão. Bem-aventurado o homem que enche deles a sua aljava.

Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,

ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ na-enye.

Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,

otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.

Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ

onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.

Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro

na-arụrịta ụka nʼama.

Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,

ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;

ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị

na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;

ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv

gburugburu tebul gị.

Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ

na-atụ egwu Onyenwe anyị.

Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị

Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,

ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;

ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị

na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;

ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv

gburugburu tebul gị.

Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,

ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,

ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị

e ji achọ ụlọeze mma.

Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ;

ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi.

Chineke gọziri ha sị ha, "Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala."

Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.

A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.

Instruir e disciplinar

Instrui a criança no caminho em que deve andar, e quando envelhecer não se desviará dele. Disciplina é amor em ação.

Kuziere nwantakịrị ka họrọ ụzọ ziri ezi,

mgbe o tolitere ga-anọgide nʼime ya.

Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,

ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.

Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na hụghị ha nʼanya;

ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.

Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka bụrụ ezi nwa,

ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.

Okwu nke iri na atọ

Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị.

Ha agaghị anwụ nʼihi na tiri ha ihe.

Amamihe Kachasị ihe niile

Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,

lezienụ anya ka unu nwee nghọta.

Ilu dị iche iche nke Solomọn:

Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;

ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.

Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ga-eme ka dịrị gị nʼobi. ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe na-aga nʼokporoụzọ, mgbe na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.

O amor de Deus por crianças

Deixai vir a mim as crianças. Jesus acolheu, abençoou e honrou as crianças como modelo de fé e humildade.

Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, sịrị ha, "Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.

Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe gaghị enye unu karịa, ma bụrụ na unu arịọọ ya!

Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.

Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,

otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

Ibi ndụ dị ka ụmụ Kraịst

Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na maghị ya.

Bênção e promessa

O Senhor te abençoe e te guarde. Os filhos dos justos serão abençoados e suas gerações caminharão na retidão.

" ‘ "Onyenwe anyị gọzie unu

ma chebe unu,

Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,

ma meere unu amara,

Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,

nyekwa unu udo." 

Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe,

na mmanụ nke ala,

ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ

Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi,

ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị.

Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ,

ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị.

Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ,

ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi."

Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,

mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.

Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,

meekwa ka ngọzị m dịrị ha.

Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,

e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.

Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.

Udo ha ga-adịkwa ukwu.

"Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị,

tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ,

ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile."

Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha.

bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe nọ

mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,

mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe na-enweghị ụdịdị ọbụla.

E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị

tupu otu nʼime ha adịrị.

Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.

Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,

ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,

maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.

Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,

ụmụ ha ga-abụ ngọzị.

Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,

kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu

akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,

na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.

Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.

Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.

Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,

ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.

Criação e obediência

Pais, criai vossos filhos na disciplina e instrução do Senhor. Filhos, obedecei a vossos pais — isto é justo e agradável a Deus.

Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha

Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."

Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.

Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.

Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. Ya mere bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.

Kama bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.

Mgbe ime na-eme nwanyị, na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe mụsịrị nwa ya, dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa.

bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-