Pular para o conteúdo
Publicidade

Fim do mundo

Por Bíblia Online

A Bíblia fala sobre o fim do mundo como evento certo e definitivo. Céus e terra passarão, mas as palavras de Jesus jamais passarão. A questão não é se, mas quando.

Os céus passarão

Os céus e a terra passarão, mas as palavras de Jesus permanecerão para sempre. O mundo presente é temporário.

Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

"Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị,

" anyanwụ ga-agba ọchịchịrị.

Ọnwa agaghị enyekwa ìhè,

kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa,

ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.

O nweghị onye maara mgbe ga-abụ

"Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. bụ naanị Nna maara ya.

Mmadụ ọbụla amaghị oge ahụ

"Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.

O dia do Senhor

O dia do Senhor virá como ladrão. Os céus passarão com grande estrondo, e os elementos se dissolverão no fogo.

Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.

bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.

Ebe bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka bịa ngwangwa. Nʼihi na bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.

Ịnọ na nche

Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na dị mkpa i degara unu akwụkwọ. Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.

Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị.

Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi. Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị. Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe. Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Destruição e renovação

O Dia do Senhor trará juízo sobre os ímpios, mas também novos céus e nova terra onde habita a justiça.

Ụbọchị ukwu nke Onyenwe anyị

Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso,

na-abịakwa ọsịịsọ.

Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu.

A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.

Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma,

ụbọchị ahụhụ na mkpagbu,

ụbọchị nsogbu na mbibi,

ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ,

ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,

ụbọchị opi ike na iti mkpu agha

imegide obodo niile e wusiri ike,

na imegide akụkụ ụlọ elu niile.

"Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ,

mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì,

nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị.

A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu,

tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.

Ọlaọcha na ọlaedo ha

agaghị azọpụta ha

nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ."

A ga-erechapụ ụwa niile

site nʼọkụ ekworo ya,

nʼihi na bụ na mberede

ka ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,

ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.

A ga-ekpochapụ ala ahụ,

ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.

Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara. Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya.

Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.

"A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji.

Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ."

Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, "Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala."

Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, "Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ." Mgbe ahụ, sịkwara, "Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu."

Seja o primeiro