Publicidade

Jesus Cristo

Por Bíblia Online

Jesus Cristo é o centro de toda a Escritura — Deus encarnado, Salvador do mundo, Senhor dos senhores. Nele habita corporalmente toda a plenitude da divindade.

A divindade de Cristo

No princípio era o Verbo, e o Verbo estava com Deus, e o Verbo era Deus. Jesus é Deus revelado em carne humana.

Okwu ghọrọ mmadụ

Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.

Okwu ghọrọ mmadụ

Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke nọ site na mbụ. E sitere na ya kee ihe niile, dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.

Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ.

Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ. Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị.

Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:

Onye bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite

ma gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ga-ejidesi aka ike.

Kama, gụrụ onwe ya dị ka ihe efu,

site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu,

onye nke a mụrụ dị ka mmadụ.

Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst:

Jesus, o Filho de Deus

Tu és o Cristo, o Filho do Deus vivo! Jesus revelou o Pai e demonstrou sua autoridade divina por palavras e obras.

jụrụ ha sị, "Ma unu onwe unu, bụ onye ka unu na-asị na m bụ?"

Saimọn Pita zara sị ya, "bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ."

Jisọs gwara ya sị, "Saimọn Pita nwa Jona, bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka mata ya.

"Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel" (nke bụ ma asụgharịa ya, "Chineke nọnyeere anyị").

Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, "Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!"

Ma gbakwara nkịtị, zaghị ihe ọbụla.

Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, "bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?"

Jisọs sịrị, "Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe."

Ma sịrị ha, "Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.

Baptizim na usoro ndị agbụrụ Jisọs

Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, "bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma."

Eu Sou

Jesus disse: antes que Abraão existisse, Eu Sou. Ele se identificou com o nome divino revelado a Moisés na sarça ardente.

Jisọs sịrị ha, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya."

Ma Mosis jụrụ Chineke sị, "bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,ha ga-ajụ m sị, Gịnị bụ aha ya?Gịnị ka m ga-aza ha?"

Chineke sịrị Mosis, "ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ABỤ M zitere gị.’ "

Mụ na nna m bụ otu."

Jisọs sịrị ha, "Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ." Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.

Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.

Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla masịrị ya ndụ. Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.

Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ.

O Salvador e Senhor

Jesus é o caminho, a verdade e a vida. Não há outro nome dado entre os homens pelo qual devamos ser salvos.

Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma bụghị site na m.

Jisọs sịrị ya, "Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ bụ na matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, zi anyị Nna ahụ? bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya.

Jisọs gwara ya, "Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na nwụrụ anwụ, ga-adị ndụ ọzọ.

Ma Jisọs sịrị ya, "bụ na m agwaghị gị sị na bụrụ na kwere ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?"

Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị."

Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, "Lee, nke a bụ mmiri. dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?"

Filip sịrị, "bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim."

Onozi ahụ sịrị, "Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke." O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim.

A supremacia de Cristo

Ele é o resplendor da glória de Deus e a expressão exata do seu ser. Toda a plenitude habita nele e por Ele tudo subsiste.

na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. Ya mere, bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.

Jisọs onyeisi nchụaja anyị

Ebe bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike. Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.

Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.

Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.

Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,

burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,

ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,

onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.

Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:

bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.

E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ hụrụ;

bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.

Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

Confessar a Cristo

Todo aquele que confessa que Jesus é o Filho de Deus, Deus permanece nele e ele em Deus. A fé em Cristo é a vitória.

Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.

Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.

E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.

Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.

Onye pụrụ imeri ụwa, ma bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?

Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.

Ma bụrụ na ga-eji ọnụ gị kwupụta, na "Jisọs bụ Onyenwe anyị," kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

Viver em Cristo

Já não sou eu quem vive, mas Cristo vive em mim. Ele supre toda necessidade, dá paz e reina como Senhor.

bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.

Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.

Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.

Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.

Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.

Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.

Nʼihi na bụ naanị otu Chineke dị. bụkwa naanị otu onye ogbugbo dị nʼetiti Chineke na mmadụ. Kraịst Jisọs, onye ya onwe ya bụ mmadụ.

O Rei eterno

O Rei dos reis voltará em glória e majestade. Todo joelho se dobrará e toda língua confessará que Jesus Cristo é o Senhor.

Onye nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ọcha

Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. "ga-eji mkpara igwe achị ha." na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya:

Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.

Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.

Mgbe ahụ sịrị Tọmọs, "Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere."

Tọmọs zara sị ya, "Onyenwe m na Chineke m!"

Ihe mere e ji dee akwụkwọ oziọma Jọn

dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.

Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m."

Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m. Mụ na nna m bụ otu."

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.

Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị bụ onye nke m.

Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha."

Ma Jisọs lere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ, bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. dịghị ihe rara Chineke ahụ ime."

sịrị, "Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime."

Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-