Pular para o conteúdo
Publicidade

Zekaraya 13

Nsachapụ mmehie

1 "Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.

2 "Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile. 3 bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya.

4 "Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, 5 Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.6 bụrụ na onye ọbụla ajụọ, Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?Ha ga-azaghachi, Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.

Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ agbasasịa

7 "Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,

na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,"

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

"Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,

igwe atụrụ13:7 Ya bụ, igwe atụrụ nke ọ na-achị ga-agbasasịkwa.

Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.

8 Nʼala ahụ niile," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,

"Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,

ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.

9 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.

Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,

jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.

Ha ga-akpọku aha m,

aga m azakwa ha.

Aga m asịkwa, Ndị a bụ ndị m,

Ha onwe ha ga-asịkwa, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também