Publicidade

Zacarias 9

Ikpe ọmụma megide ndị iro Izrel

1 Okwu Amụma.

Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,

na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,

nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile

na ebo niile nke Izrel dị.

2 Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;

tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

3 Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,

tụkọba ọlaọcha dịka aja,

na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.

4 Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere

ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,

ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.

5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.

Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.

Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.

A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.

Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.

6 Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,

aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.

7 Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,

wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.

Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,

ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.

Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.

8 Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,

ka ndị iro ghara ịbata na ya.

Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,

nʼihi na anọ m na nche ugbu a.

Ọbịbịa nke eze Zayọn

9 Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!

Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!

Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,

onye ezi omume na onye nwere mmeri,

onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,

ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.

10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,

na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem;

a ga-agbajikwa ụta agha.

Ọ ga-ewetara mba niile udo,

ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ,

sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.

11 Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,

nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.

12 Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.

Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.

13 Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,

tinye Ifrem dịka àkụ.

Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,

ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.

Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.

Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya

14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,

àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,

ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.

15 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.

Ha ga-ebibi,

zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.

Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;

ha ga-ejupụta dịka efere,

dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.

16 Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,

dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya.

Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa

e tinyere nʼokpueze si na-egbuke.

17 Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!

Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma,

mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-