Pular para o conteúdo
Publicidade

O juízo final

Por Bíblia Online

O juízo final é a conclusão da história humana. Todos os seres humanos comparecerão diante do trono de Deus para o julgamento eterno — os salvos para a vida, os ímpios para a condenação.

O grande trono branco

Vi um grande trono branco e os mortos diante de Deus. Os livros foram abertos e cada um foi julgado segundo as suas obras.

Ikpe Ikpeazụ

Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.

Ịdọ aka na ntị nakwa ọkpụkpọ oku

"Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.

Ịdọ aka na ntị nakwa ọkpụkpọ oku

"Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka. Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.

"Anọkwa m na-ele anya

"hụ ka e doziri ocheeze,

ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.

Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,

agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.

Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,

ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.

"Anọkwa m na-ele anya

"hụ ka e doziri ocheeze,

ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.

Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,

agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.

Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,

ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.

Iyi na-asọ ka ọkụ

si nʼihu ya na-asọpụta.

Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi.

Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya.

Ndị ikpe nọdụrụ ala,

asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.

Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi. Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.

Preparação para o juízo

Deus estabeleceu um dia para julgar o mundo com justiça. Arrependei-vos, porque o juízo se aproxima e cada palavra será pesada.

Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie."

Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ga-abụ onye ikpe na-amaghị."

Ikpe nke ikpeazụ

"Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.

Ikpe nke ikpeazụ

"Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.

"Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.

"Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka gba ọtọ anyị enye gị uwe? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?

"Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, bụ m ka unu mesoro omume ahụ.

"Mgbe ahụ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.

"Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge bụ onye ọbịa, maọbụ oge gba ọtọ, maọbụ oge nọ nʼọrịa, maọbụ nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?

"ga-aza ha sị, Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.

"Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi."

Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,

ya na ihe nzuzo anyị niile,

ma ha dị mma ma ha dị njọ.

A gwara m onwe m,

"Chineke ga-ekpe,

ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe,

nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme,

oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe."

"Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ. Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ? Nʼihi na dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!

Segurança em Cristo

Quem crê no Filho tem a vida eterna e não entra em juízo. O amor de Deus é nosso refúgio diante do juízo vindouro.

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.

Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. Mgbe bịara, ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe.

Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.

Chineke bụ ịhụnanya. Onye bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.

Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.

Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.

Dị ka bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma bụghị nʼihi ibu mmehie, kama bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.

Nʼihi,

"Na oge na-adịghị anya,

onye ahụ nke na-abịa ga-abịa

gaghị anọkwa ọdụ."

Ma,

"Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.

Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị

nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ."

Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.

Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị. Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe. Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na na-abịa,

na-abịa ikpe ụwa ikpe.

ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe,

jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

Seja o primeiro

Este artigo te tocou? Faça uma oração!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.