Publicidade

Eclesiastes 12

1 Ya mere, cheta Onye kere gị

mgbe ka bụ okorobịa,

tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,

na mgbe afọ aka abịarubeghị

mgbe ga-asị, "Ha anaghị atọkwa m ụtọ."

2 Tupu anyanwụ na ìhè,

ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,

na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.

3 Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,

mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,

mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,

mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,

4 mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,

mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,

mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,

ma abụ ha niile na-ala ala,

5 mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;

na ihe egwu nke okporoụzọ,

mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru

mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,

agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.

Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,

ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.

6 E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,

tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,

tupu ite adawaa nʼisi iyi,

tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.

7 Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;12:7 Jen 3:19; Job 34:15; Abụ 90:3

mmụọ12:7 Ekl 3:21 anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.

8 "Ihe efu! Ihe efu!" ka onye ozizi kwuru.

"Ihe niile bụ ihe efu!"

Nchịkọta okwu niile

9 bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe maara. tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10 Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.

11 Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere. 12 Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a.

Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.

13 Ugbu a anụla ihe ndị a niile,

ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:

Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,

nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.

14 Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,

ya na ihe nzuzo anyị niile,

ma ha dị mma ma ha dị njọ.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_15-35-42-