Publicidade

Cânticos 1

1 Abụ nke abụ nke Solomọn.

Onye a hụrụ nʼanya

2 Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,

nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.

3 Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,

aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,

ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.

4 Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.

Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.

Ndị Enyi

Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.

Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya.

Onye a hụrụ nʼanya

Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.

5 Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,

unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.

Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda

dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.

6 Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.

Ọ bụ anwụ gbajiri m.

Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,

zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,

ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.

7 Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,

ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?

Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?

Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu

nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.

Ndị Enyi

8 Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,

soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ

meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa

dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

9 Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya

e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.

10 Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma,

olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.

11 Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo,

nke e ji ọlaọcha chọọ mma.

Onye a hụrụ nʼanya

12 Mgbe eze nọ na tebul ya,

mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.

13 Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa

nke dị nʼetiti ara m abụọ.

14 Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna

nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

15 Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.

Leenụ ka ị si maa mma!

Anya gị dịka nduru.

Onye a hụrụ nʼanya

16 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.

E, ị mara mma.

Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

17 Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,

ntuhie ya bụkwa osisi fịa.

Veja também

Publicidade
Cânticos
Ver todos os capítulos de Cânticos
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-