Publicidade

Cânticos 2

Onye a hụrụ nʼanya

1 Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,

na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

2 E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,

otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.

Onye a hụrụ nʼanya

3 Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,

mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.

Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,

mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.

4 Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,

ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.

5 Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;

werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,

nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.

6 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

7 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,

eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:

Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,

ruo mgbe ọ masịrị ya.

8 Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!

Lee ya ka ọ na-abịa,

na-amali elu nʼelu ugwu niile,

na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.

9 Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.

Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,

ọ na-esikwa na oghereikuku

na nʼoghere dị ya na-elebata anya.

10 Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,

"Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,

onye m mara mma, soro m.

11 Lee, oge oyi agafeela,

udu mmiri agabigakwala.

12 Okoko osisi epupụtala nʼala;

oge eji agụ egwu eruokwala,

a na-anụ abụ nduru

nʼala anyị niile.

13 Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,

isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.

Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.

Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m."

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

14 Nduru m nọ nʼọgba nkume,

nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,

gosi m ihu gị,

mee ka m nụ olu gị,

nʼihi na olu gị dị ụtọ,

ihu gị makwara mma.

15 Jidenụ nkịta ọhịa,

ụmụ nkịta ọhịa niile

na-emebiri anyị ubi,

ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.

Onye a hụrụ nʼanya

16 Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.

Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,

17 tutu chi ụtụtụ abọọ

mgbe onyinyo niile na-agabigakwa.

Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,

dị ka mgbada

maọbụ nwa ele

nke nọ nʼelu ugwu.

Veja também

Publicidade
Cânticos
Ver todos os capítulos de Cânticos
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-