Publicidade

Cânticos 8

1 O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;

nke otu nne mụrụ mụ na ya

m gaara esutu gị ọnụ

mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ

ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.

2 Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,

ka ị nọdụ nʼebe ahụ,

nʼụlọ onye ziri m ihe.

Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,

mmanya ụtọ nke pomegranet.

3 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

4 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,

unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta

tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.

Ndị Enyi

5 Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,

onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.

Onye a hụrụ nʼanya

Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;

nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;

nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.

6 Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,

dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị

nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,

ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.

Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,

dịka ọkụ nke dị ukwu.

7 Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,

osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.

Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye

akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,

a ga-eleda ya anya nke ukwuu.

Ndị Enyi

8 Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta

ma ọ kpụbeghị ara.

Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,

nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?

9 Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,

anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;

ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,

anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.

Onye a hụrụ nʼanya

10 Abụ m mgbidi,

ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.

Otu a ka m siri dị nʼanya ya

dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.

11 Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,

o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.

Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta

puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.

12 Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.

Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,

ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

13 Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,

gị na ndị enyi gị,

kwere ka m nụ olu gị.

Onye a hụrụ nʼanya

14 Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,

bịakwute m dịka mgbada,

maọbụ dịka nwa ele

na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.

Veja também

Publicidade
Cânticos
Ver todos os capítulos de Cânticos
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-