Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ nke Abụ 6

Ndị Enyi

1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,

ebee ka onye hụrụ nʼanya jere?

Olee ụzọ o sitere?

Ka anyị soro gị chọọ ya.

Onye a hụrụ nʼanya

2 gara nʼubi ya a gbara ogige,

nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,

ijegharị nʼetiti okoko urodi,

na ịchịkọta okoko lili.

3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.

na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

4 Onye m hụrụ nʼanya, mara mma dịka Tịaza, mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.6:4 Tịaza bụ obodo ochie eze Jeroboam họpụtara ka ọ bụrụ isi obodo ọchịchị nke alaeze ugwu. Ọ bụ na senchuri nke iri (Tupu a mụọ Kraịst). 1Ez 14:17; 1Ez 15:21,33; 16:6,8,15,23

dị mma ile anya dịka Jerusalem;

dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.

5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ,

nʼihi na i jirila anya gị dọta m.

Agịrị isi gị dị ka igwe ewu6:5 Abk 4:2

nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.

6 Eze gị dị ka igwe atụrụ

nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.

Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,

dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.

7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị

dị ka pomegranet e kere abụọ.

8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,

na iri ndị iko nwanyị asatọ,

na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,

9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.

Naanị otu nwanyị nne ya nwere,

masịrị onye mụrụ ya.

Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,

ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.

Ndị Enyi

10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,

nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,

dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,

ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,

ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,

na mata ma nʼosisi pomegranet mara ifuru.

12 Tupu m mata ebe m nọ,

agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.

Ndị Enyi

13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;

laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya

dịka bụ ite egwu ndị Mahanaim?

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também