Pular para o conteúdo
Publicidade

Língua

Por Bíblia Online

A língua tem poder de vida e de morte. A Bíblia compara a língua ao leme de um navio e à faísca que incendeia uma floresta. Dominar a língua é prova de maturidade espiritual.

O poder da língua

A morte e a vida estão no poder da língua. Quem a domina é varão perfeito, capaz de controlar todo o corpo.

Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.

Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.

Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka.

bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. Otu a kwa, bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka gaa ebe chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. Otu a ka dịkwa ire anyị. bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.

Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.

bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya. Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi. bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta? Ụmụnna m, osisi fiig pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.

Palavras sábias

A língua branda quebra até ossos. A palavra certa no tempo certo é como maçãs de ouro em salvas de prata.

Nwee ndidi, nʼikpeazụ ga-enwe mmeri,

nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.

Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,

ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.

Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,

ma okwu ụgha anaghị adịgide.

Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị

ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.

A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma bụrụ na ha gba nkịtị,

gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma bụrụ na ha e jide ire ha.

Disciplinar a fala

Quem guarda a boca e a língua guarda a sua alma de angústias. A religião sem controle da língua é vã.

bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

Nkwupụta mmehie

Asịrị m, "Aga m elezi anya nʼụzọ m niile

ma debe ire m ka m ghara ikwuhie;

aga m eji ihe kechie ọnụ m

mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume."

Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,

ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

chezie ire gị ka ghara ikwu ihe ọjọọ,

chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka gharakwa ịgha ụgha.

Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,

ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.

Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;

nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.

Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị

na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

O Onyenwe anyị, maara ihe m gaje ikwu

tupu m kwuo ya.

O Onyenwe anyị, zọpụta m

site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha

na ire na-ekwu okwu aghụghọ.

Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ

na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.

Ndị na-asị,

"bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri;

egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, bụ onye na-achị anyị?"

O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,

nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.

Toda língua confessará

Ao nome de Jesus todo joelho se dobrará e toda língua confessará que Jesus Cristo é Senhor, para glória de Deus Pai.

bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu,

nyekwa ya aha kachasị aha niile elu.

Ka ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala,

ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa.

Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,

maka inye Chineke bụ Nna, otuto.

Ịhụnanya

A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.

Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ga-abụ onye ikpe na-amaghị."

Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. Onyenwe anyị sịrị, "Lee! bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime. Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya."

Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.

Seja o primeiro

Este artigo te tocou? Faça uma oração!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.