Pular para o conteúdo
Publicidade

O marido

Por Bíblia Online

A Bíblia define o papel do marido com clareza: amar a esposa como Cristo amou a Igreja, ser fiel, protetor e líder servo no lar.

Amar como Cristo amou

Maridos, amai vossas mulheres como Cristo amou a Igreja e se entregou por ela. O amor do marido deve ser sacrificial e incondicional.

Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.

Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.

Ma otu dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ. Mgbe na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ka nọ na-ewe iwe. Enyela ekwensu ohere. Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị. Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta. Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.

Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

Okwu dịrị ezinaụlọ ndị nke Kraịst

Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.

Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.

Fidelidade conjugal

O casamento é honroso e o leito conjugal é santo. O marido deve ser fiel à esposa da sua juventude em pensamento e ação.

Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;

mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.

Gịnị mere ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,

ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?

Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,

nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.

Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;

ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke lụtara nʼokorobịa gị.

Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,

ka ara dị ya nʼobi zuore gị,

ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.

Gịnị ka na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?

Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?

Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma bụghị nʼihi ịkwa iko, na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka kwaa iko. bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya."

Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama bụ nwunye ya na-achị ya.

Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya. A sịkwa na hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.

Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.

Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

Convivência com sabedoria

O marido sábio vive com a esposa com entendimento, dando-lhe honra como co-herdeira da graça. A união conjugal reflete Cristo e a Igreja.

Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.

bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.

Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma. Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.

Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.

Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.

na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.

Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.

bụrụkwanụ na masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị."

Ndị Kraịst na ndị na-ekweghị ekwe

Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?

Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. dịghị ekwo ekworo, naghị enwe anya ukwu, naghị anya isi. nakwaghị ebuli onwe ya elu. naghị eme ihe na-akpasu iwe, naghị achọ ihe nke naanị ya, naghị ewe iwe ọsịịsọ. nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama na-aṅụrị nʼeziokwu. na-edi ihe niile, na-ekwerekwa ihe niile, na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.

Seja o primeiro