Meditação
A meditação na Palavra de Deus é prática espiritual essencial. Diferente da meditação oriental, a meditação bíblica é reflexão profunda sobre as Escrituras — ruminar a Palavra dia e noite.
Meditar na Palavra dia e noite
Bem-aventurado o homem que medita na lei do Senhor de dia e de noite. Ele é como árvore plantada junto a ribeiros de águas.
Onye ihe na-agara nke ọma
Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!
Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.
Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,
ha na-anọnyere m oge niile.
Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,
nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile.
Enwere m nghọta karịa ndị okenye
nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi.
Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị
na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
Iwu gị na-amasị m;
agaghị m elefu okwu gị anya.
ג Gimel
nʼihi na iwu gị na-amasị m
nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya.
Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,
ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
ז Zayin
Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;
olileanya m dị nʼokwu gị.
Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,
nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
Frutos da meditação
A meditação produz entendimento, alegria e adoração. Quem medita na Palavra encontra direção, paz e renovação espiritual.
Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m,
ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile,
bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.
Aga m ekwu okwu amamihe,
ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche."
Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga;
ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile
na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,
ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;
aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,
dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.