Pular para o conteúdo
Publicidade

Milagres de Jesus

Por Bíblia Online

Os Evangelhos registram dezenas de milagres realizados por Jesus — curas, ressurreições, domínio sobre a natureza e libertações. Cada milagre revelava sua divindade e compaixão.

Curas de cegos e surdos

Jesus devolveu a visão aos cegos e a audição aos surdos, manifestando seu poder sobre toda enfermidade e deficiência.

Jisọs agwọọ ndị ìsì na onye ogbi

Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, "Nwa Devid, meere anyị ebere!"

Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe nọ. jụrụ ha ajụjụ sị, "Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?"

Ha zara sị ya, "E, Onyenwe anyị, anyị kweere."

O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, "Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị." Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha "Unu agwakwala onye ọbụla." Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.

Ndị ìsì abụọ Jisọs gwọrọ

Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, "Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!"

Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, "Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!"

Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, "Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?"

Ha zara sị ya, "Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ."

Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

Jisọs agwọọ onye ìsì na Betsaida

Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka, duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. jụrụ ya sị, "na-ahụ ihe ọbụla?"

Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, "Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị."

Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma. zilagara ya ụlọ ya sị ya, "Abanyekwala nʼime obodo."

Ọgwụgwọ onye ntị chiri na onye ogbu

Emesịa, hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs. Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.

O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, "Ef fata," nke pụtara "Meghee!" Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, malite ikwu okwu nke ọma.

Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile. tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, "O meela ihe niile nke ọma. na-eme ka bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu."

Ọgwụgwọ Batimiọs onyeisi

Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara "nwa nwoke Timiọs"), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. Mgbe nụrụ na bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, "Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!"

Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, "Nwa Devid, meere m ebere!"

Jisọs kwụsịrị kwuo sị, "Kpọọnụ ya."

Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, "Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, na-akpọ gị." tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs.

Jisọs sịrị ya, "Gịnị ka chọrọ ka m meere gị?"

Onye ìsì ahụ sịrị ya, "Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ."

Jisọs sịrị ya, "Laa, okwukwe gị azọpụtala gị." Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

Onye ìsì ahụ ụzọ

O ruo ka bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Mgbe nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, jụrụ ihe na-eme. Ha gwara ya, "Jisọs onye Nazaret na-agafe."

O tiri mkpu sị, "Jisọs nwa Devid, meere m ebere!"

Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, "Nwa Devid, meere m ebere!"

Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, jụrụ ya, "Gịnị ka chọrọ ka m meere gị?"

sịrị, "Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ."

Jisọs sịrị ya, "Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị." Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.

Jisọs agwọọ onye ìsì

Mgbe na-agafe, hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, "Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?"

Jisọs sịrị, "Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa."

Mgbe o kwusiri nke a, bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. gwara ya, "Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị" (nke a pụtara "Zitere"). gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.

Curas de paralíticos e enfermos

Paralíticos caminharam, leprosos ficaram limpos e todo tipo de doença foi curada pelo toque e pela palavra de Jesus.

Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, "Onyenwe m, bụrụ na chọrọ, pụrụ ime ka m dị ọcha."

O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, "Achọrọ m ka dị ọcha, dịrịkwa ọcha!" Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, "Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka bụrụ ihe ama nye ya."

Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, "Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile."

Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, "Nwoke a na-ekwulu Chineke."

Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, sịrị, "Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? Olee nke ka mfe ikwu? bụ sị, A gbagharala gị mmehie gị niile,ka bụ sị, Bilie jee ije? Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Bilie, chịrị ute gị laa!" Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.

Nʼebe a ka hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, "O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?"

Ma zara ha sị, "bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ga-eme? ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? gaghị ejide ya dọpụta ya? Mmadụ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike."

Mgbe ahụ sịrị nwoke ahụ, "Setịpụ aka gị." Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.

Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka mata banyere ya. gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. malitekwara ile ha ọbịa.

Jisọs agwọọ onye ekpenta

Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, "bụrụ na chọrọ, pụrụ ime ka m dị ọcha."

Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, "Achọrọ m, dị ọcha!" Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka dị ọcha.

Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. bụ mmadụ anọ bu ya. Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị."

Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, "Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma bụghị naanị Chineke?"

Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. sịrị ha, "Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? Olee nke ka mfe: bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, A gbagharala gị mmehie gị niile,ka bụ i sị, Bilie chịrị ute gị jegharịa? Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị." O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, "Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!"

Ọgwụgwọ onye aka ya kpọnwụrụ

Nʼoge ọzọ, banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. Ma gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, "Bilie guzoro nʼetiti ebe a."

Mgbe ahụ jụrụ ha sị, "Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: bụ ime ezi ihe ka bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka bụ ịla ndụ nʼiyi?" Ma ha gbachiri nkịtị.

O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. sịrị nwoke ahụ, "Setịpụ aka gị." O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.

Nwoke onye ekpenta

Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe hụrụ ya, rịọ ya sị, "Onyenwe m, bụrụ na chọrọ, pụrụ ime ka m dị ọcha."

Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, "Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!" Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya.

Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya. Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.

Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, sịrị, "Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị."

Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, "Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma bụghị naanị Chineke?"

Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? Olee nke ka mfe ikwu: bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka bụ sị, Bilie jee ije? Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie." sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, "Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!" Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.

Nʼụbọchị izuike ọzọ, banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ma ebe maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, "Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a." Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.

Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, "Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; bụ ime ihe ọma ka bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka bụ ịla ndụ nʼiyi?"

Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, sịrị ya, "Setịpụ aka gị." O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.

Okwukwe onye ọchịagha

Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, banyere na Kapanọm. Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ. Mgbe nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka bịa gwọọ ohu ya. Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, "O kwesiri ka i mere ya ihe a. Nʼihi na hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere." Jisọs sooro ha gawa.

Ma mgbe nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, "Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka bata nʼokpuru ụlọ m. bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ga-agwọkwa odibo m. Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a gaa,gaa, sịkwa onye nke ọzọ bịa,bịa. Ana m asị ohu m, mee nke a,na-emekwa ya."

Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, "Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a bụladị nʼIzrel." Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.

Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara dị ya ike afọ iri na asatọ. na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. Mgbe Jisọs hụrụ ya, kpọrọ ya sị ya, "Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị." Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.

Jisọs agaa nʼụlọ onye Farisii

Otu ụbọchị izuike, mgbe gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, "O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka bụ na o zighị?" Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.

Ọgwụgwọ ndị ekpenta iri

Ka na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. Mgbe banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, "Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere."

Mgbe hụrụ ha, sịrị ha, "Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu." Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.

Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. bụ onye Sameria.

Jisọs jụrụ sị, "bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?" Mgbe ahụ, sịrị ya, "Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị."

Ọgwụgwọ nʼọdọ mmiri Betsaida

Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya. Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, jụrụ ya sị, "chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?"

Onye ọrịa ahụ zara, "Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye."

Jisọs gwara ya, "Bilie, chilie ute gị jegharịa." Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, chịlịri ute ya, malite ijegharị.

Ihe a mere nʼụbọchị izuike.

Ọzọkwa, bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. Mgbe nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na nọ nʼọnụ ọnwụ.

Jisọs sịrị ya, "bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị."

Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, "Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ."

Jisọs sịrị ya, "Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ."

Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. Mgbe ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. Mgbe jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, "Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie."

Nwoke ahụ ghọtara na bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, "Nwa gị nwoke ga-adị ndụ." Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.

Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

A mulher com fluxo de sangue

Uma mulher que sofria há doze anos tocou a orla do manto de Jesus e foi curada instantaneamente pela sua fé.

Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, "bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m."

Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, "Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma." Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.

Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, na-aga nʼihu ịdị njọ. Ebe nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, "bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m." Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.

dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.

Jisọs sịrị, "Onye metụrụ m aka?"

Mgbe na-enweghị onye pụtara kwuo sị na bụ ya. Pita gwara ya sị, "Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị."

Ma Jisọs sịrị, "Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ."

Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. gwara ya sị, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo."

Ressurreições

Jesus ressuscitou mortos — a filha de Jairo, o filho da viúva de Naim e Lázaro. Ele é Senhor sobre a morte.

Nwata nwanyị na ọtụtụ ndị ọzọ

Mgbe nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, "dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu dị, bịa ka bikwasị ya aka gị. ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ." Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.

Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja. sịrị ha, "Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama nọ nʼụra." Ma ha chịrị ya ọchị. Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ.

Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe hụrụ ya, dara nʼala nʼụkwụ ya, rịọsie ya arịrịọ ike sị, "Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka dịkwa ndụ." Ya mere, Jisọs soro ya gawa.

Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya.

Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. Mgbe batara, sịrị ha, "Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, na-arahụ ụra!" Ma ha chịrị ya ọchị.

Mgbe chụpụsịrị ha niile nʼezi, kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. O jidere ya nʼaka sị ya, "Talita koum!" (nke pụtara, "Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!"). Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.

gara nʼihu sị ha, "Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị,

" Anyị gburu unu ọja,

ma unu adịghị ete egwu.

Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu,

ma unu ebeghị akwa.

Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie. Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi."

Nwanyị onye mmehie etee Jisọs mmanụ

Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe matara na nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.

Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka bịa nʼụlọ ya. Nʼihi na otu nwata nwanyị mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ.

Mgbe na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.

Mgbe ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ."

Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."

Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. sịrị ha, "Unu ebezila akwa, nʼihi na nwụghị anwụ kama nọ nʼụra."

Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na nwụrụ anwụ. Ma o jidere ya nʼaka, sị, "Nwa m, bilie!" Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.

Ọnwụ Lazarọs

Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, "Onyenwe anyị, onye ahụ nke hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa."

Mgbe Jisọs nụrụ ya, sịrị, "Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto." Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya. Mgbe nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ nọ. Ya mere, gwara ndị na-eso ụzọ ya, "Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa."

Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. na-agakwa ebe ahụ ọzọ?"

Jisọs zara, "bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ. Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha."

Mgbe o kwusiri nke a, gwakwara ha, "Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra."

Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onyenwe anyị, bụrụ na na-arahụ ụra, ga-adị mma." Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.

Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, "Lazarọs anwụọla.

Domínio sobre a natureza

Jesus acalmou a tempestade, andou sobre as águas e multiplicou pães. A natureza obedece à voz do seu Criador.

Ebili mmiri adajụọ

Mgbe banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, "Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi."

Ma zaghachiri, "Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?" Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.

O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, "bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru."

Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, "Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri."

Ma Jisọs gwara ha sị, "dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie."

Ha zara ya sị, "bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere."

sịrị ha, "Wetaranụ m ha nʼebe a." gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.

Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri.

Jisọs enye puku mmadụ anọ nri

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ."

Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, "Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?"

Jisọs jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere?"

Ha sịrị ya, "Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole."

gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.

Ịtụ ụtụ ụlọnsọ ukwu

Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, "Onye ozizi unu dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?"

Pita zara ha sị, "E, na-atụ ụtụ."

Mgbe batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, "Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? bụ nʼaka ụmụ ha, ka bụ nʼaka ndị ọbịa?"

Ma mgbe Pita zara ya sị, "bụ site nʼaka ndị ọbịa."

Jisọs sịrị ya, "dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. Ma otu dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ga-egbute. ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka bụrụ ụtụ nke mụ na gị."

Jisọs abụọ osisi fiig ọnụ

Nʼụtụtụ, mgbe laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, sịrị ya, "Malite taa gaa nʼihu, gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!" Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, "Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?"

Jisọs zara sị ha, "Nʼezie agwa m unu, bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.ga-emezukwa. Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya."

Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, "Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?"

biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, "Kwụsị! Dere jii!" Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.

sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? bụ na unu enwebeghị okwukwe?"

Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!"

Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, "Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri."

Ma zara sị ha, "Nyenụ ha ihe ha ga-eri."

Ha sịrị ya, "Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?"

Ma jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta."

Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, "Ogbe achịcha ise na azụ abụọ."

Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. Ha niile riri rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.

Mgbe hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka chọrọ ịgafe ha. Ma mgbe ha hụrụ ya ka na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na bụ mmụọ, tie mkpu akwa. Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha.

Na-atụfughị oge, gwara ha sị, "Nweenụ obi ike! bụ m. Unu atụla egwu." Emesịa, rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.

Jisọs enye puku mmadụ anọ nri

Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri. bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa."

Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, "Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?"

Jisọs jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere?"

Ha zara sị, "Asaa."

gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ. Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, gwara ha ka ha kesaakwa ya. Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.

Osisi fiig a bụrụ ọnụ

Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. Site nʼebe dị anya, hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe bịaruru osisi ahụ nso, gagharịrị nʼukwu ya niile ma ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. Mgbe ahụ, gwara osisi ahụ sị, "Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi." Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.

Osisi fiig ahụ a kpọnwụọ

Nʼisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha na-agafe, ha hụrụ na osisi fiig a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ. Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, "Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ bụrụ ọnụ akpọnwụọla!"

Jisọs zara ha sị, "Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. Nʼezie agwa m unu, bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ kwuru ga-emezukwa. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ga-abụkwa nke unu. Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.

Ọkpụkpọ ndị mbụ na-eso ụzọ ya

Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, rịọrọ ya ka kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.

Mgbe o kwusiri okwu, gwara Saimọn sị, "Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ."

Saimọn zara sị, "Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile."

Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.

Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, dara nʼukwu Jisọs sị, "Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie." Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya.

Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, "Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ga na-akụta mmadụ." Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.

Jisọs emee ka ebili mmiri dajụọ

Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, sịrị ha, "Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri." Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, ma mgbe ha na-aga, rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.

Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, "Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!"

O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. sịrị ha, "Ebee ka okwukwe unu dị?"

Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? na-enye bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị."

Jisọs emee ka ebili mmiri dajụọ

Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, sịrị ha, "Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri." Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, ma mgbe ha na-aga, rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.

Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, "Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!"

O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. sịrị ha, "Ebee ka okwukwe unu dị?"

Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? na-enye bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị."

Ọgwụgwọ nwoke mmụọ ọjọọ ji

Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili.

Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, "Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara."

zara ha sị, "Unu nye ha nri ka ha rie."

Ha zaghachiri ya sị, "Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri." Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise.

gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, "Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise." Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.

Jisọs emee mmiri ya aghọọ mmanya

Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ. A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a. Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, "Ha enweghị mmanya."

Jisọs sịrị ya, "Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị."

Nne ya gwara ndị na-eje ozi, "Ihe ọbụla gwara unu, meenụ ya."

A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.

Jisọs gwara ha, "Gbajuonụ ite ndị a mmiri." Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.

Mgbe ahụ, gwara ha, "Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche."

Ha mekwara nke a. Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ghọọ mmanya ọnụ. mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche sị ya, "Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a."

Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.

jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ga-eme.

Filip zara ya, "Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị."

Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, "Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?"

Jisọs sịrị, "Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala." E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.

Mgbe ha niile rijuchara afọ, sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi." Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.

Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. Ma sịrị ha, "Unu atụla egwu. bụ m." Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.

Jisọs na ọrụ ebube nke igbute azụ

Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. Saimọn Pita sịrị ha, "Ana m aga igbu azụ." Ha sịrị, "Anyị ga-eso gị." Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.

Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na bụ Jisọs.

Jisọs sịrị ha, "Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?"

Ha zara ya, "Mba."

gwara ha, "Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ." Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.

Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, "bụ Onyenwe anyị!" Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na "bụ Onyenwe anyị," yiiri uwe ya (nʼihi na gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.

Jisọs gwara ha, "Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a." Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.

Libertações

Jesus expulsou demônios com autoridade. Os espíritos impuros não resistiam à sua palavra e saíam imediatamente.

Okwukwe nke onye ọchịagha

Mgbe banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. sịrị, "Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ."

Jisọs sịrị ya, "bụ m bịa gwọọ ya?"

Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, "Onyenwe m, ekwesighị m ka bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, gaa.gaa, sịkwa onye nke ọzọ, bịa.bịa. Ana m asị ohu m, mee nke a.na-emekwa ya."

Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, "Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; bụladị nʼIzrel niile. Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị."

Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, "Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị." Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.

Ọgwụgwọ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu

Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, "Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?"

Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, "bụrụ na chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a."

nyere ha iwu sị ha, "Ngwa, gaanụ!" Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.

Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya. Mgbe chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, "Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel."

Jisọs na ekwensu

Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu.

Okwukwe nwanyị Kena

Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, "Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile."

Ma gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, "Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!"

zara sị, "Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel."

Ma bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, "Onyenwe m, nyere m aka!"

zara sị, "O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta."

zara sị, "bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala."

Jisọs zara sị ya, "Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe na-arịọ." Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

gwọrọ nwa akwụkwụ

Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, rịọọ ya sị, "Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma."

Jisọs zara sị, "Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a." Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.

Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, sị, "Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye bụ, Onye Nsọ nke Chineke."

Ma Jisọs baara ya mba sị ya, "Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!" Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.

Jisọs agwọọ nwoke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya

Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, bụladị iji eriri igwe kee ya. Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.

Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. O tiri mkpu nʼoke olu sị, "Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ." Nʼihi na o nyela ya iwu sị, "Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!"

Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, "Gịnị bụ aha gị?"

Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, "Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ." Ma rịọsiri ya arịrịọ ike ka ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.

Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, "Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha." hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.

Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.

Ma unu na-asị, na bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, Ihe ọbụla bụ nke gara erite nʼaka m bụ kọban,(nke pụtara onyinye dịrị Chineke). Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme."

Ọzọkwa, kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, "Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a. dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta."

Okwukwe nwanyị Siria

hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na chọghị ka a mata na nọ ebe ahụ. Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, bịara daa nʼụkwụ ya. Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. rịọrọ ya ka chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.

sịrị ya, "Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta."

Ma zaghachiri ya sị, "Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala."

Mgbe ahụ, sịrị ya, "Nwanyị, zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a."

laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.

Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, "Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka daa ogbi. Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike."

zaghachiri ha sị, "Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!"

Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.

Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, "Olee mgbe ihe a bidoro?"

zara sị, "Site na mgbe bụ nwata nta. na-eme ya ka daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka laa ya nʼiyi. bụrụ na dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka."

Jisọs sịrị ya, " bụrụ na i nwere ike? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ."

Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, "Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!"

Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, "Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!"

O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, "nwụọla!" Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.

Jisọs agwọọ ọtụtụ ndị ọrịa

Mgbe hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.

Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu. Mgbe hụrụ Jisọs, bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, "Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ." Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.

Jisọs jụrụ ya sị, "Gịnị bụ aha gị?"

zara sị, "Lijiọn," nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis.

Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha.

Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere. Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha.

"Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke."

Nnwogha Jisọs

Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere. Mgbe nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu. Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke na-aga imezu na Jerusalem.

Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu. Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, "Nna anyị ukwu, ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja." mataghị ihe na-ekwu.

Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, "Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka na-eti mkpu. na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. dịghị mgbe na-ahapụ ya kama na-echihịasị ya ahụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike."

Jisọs zara sị, "Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!"

Mgbe na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya.

Jisọs ekwuo ihe banyere ọnwụ ya ọzọ

Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ rụrụ, sịrị ndị na-eso ụzọ ya,

Jisọs na mmụọ ọjọọ

Otu mgbe, na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya.

Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya.

Ma Jisọs sịrị, "O zuola!" O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, "Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị,

" Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,

onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.

Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya."

(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)

Seja o primeiro