Pular para o conteúdo
Publicidade

Motivação

Por Bíblia Online

Motivação verdadeira vem de Deus. A Bíblia nos inspira a correr a carreira da fé com perseverança, sabendo que o Senhor fortalece, guia e recompensa os fiéis.

Força do alto

Tudo posso naquele que me fortalece. Deus dá poder aos fracos e renova a força dos cansados — Ele é a fonte de toda motivação.

Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

na-enye ndị na-ada mba ike,

na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.

bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.

E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,

ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,

ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.

Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.

Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;

ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,

mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.

Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,

werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.

Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka dịrị ka nke onye nchụaja.

E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.

Nʼihi na bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ chọrọ.

Correr para o alvo

Prossigo para o alvo, para o prêmio da soberana vocação de Deus em Cristo Jesus. A corrida da fé exige disciplina e foco.

Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.

Mkpa dị mmadụ ịkwanyere onwe ya ugwu

Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ. Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.

Kraịst bụ ihe nlere anya nye anyị

Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.

Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka dị ka bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.

Propósito e missão

Deus tem planos de esperança para nós. Cada dia é oportunidade de fazer a sua vontade e avançar com confiança na missão.

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.

Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge."

Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. gaghị agbakụta unu azụ, gakwaghị ahapụ unu."

Ihe ọbụla na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka na-aga.

Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,

iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,

ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.

Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu. Nʼihi na bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa.

bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, "Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri."

Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla. Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta. Otu dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.

Seja o primeiro