Pular para o conteúdo
Publicidade

Mulher

Por Bíblia Online

A Bíblia celebra a mulher como obra-prima da criação divina. Ela é elogiada por sua sabedoria, força, beleza interior e papel fundamental na família e na sociedade.

A mulher na criação

Deus criou o homem e a mulher à sua imagem. A mulher foi formada como ajudadora idônea — parceira de igual dignidade e valor.

Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya,

nʼoyiyi Chineke ka o kere ha,

nwoke na nwanyị ka o kere ha.

Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.

Nwoke ahụ kwuru sị,

"Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,

na anụ ahụ si nʼahụ m,

a ga-akpọ ya nwanyị,

nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya."

Virtude e caráter

A beleza é vã e a formosura passageira, mas a mulher que teme ao Senhor é digna de louvor. Seu caráter é seu maior tesouro.

Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.

Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,

ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,

ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,

ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.

Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,

ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.

ka mma ibi nʼọzara

karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.

Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na bụ onye nwere ezi agwa.

Sabedoria e serviço

As mulheres da Bíblia foram líderes, profetisas e discípulas fiéis. Jesus honrou as mulheres e as incluiu em seu ministério.

Akụkọ ọgha mkpụrụ

Mgbe ihe ndị a gasịrị, gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya, na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.

Di na nwunye

Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla,

Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.

Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.

Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.

Seja o primeiro

Este artigo te tocou? Faça uma oração!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.