Pular para o conteúdo
Publicidade

Não desista!

Por Bíblia Online

'Não desista!' é o grito do céu para a terra. Deus nos encoraja a perseverar na fé, na oração e na esperança, porque a vitória pertence aos que não se rendem.

Força na fraqueza

Os que esperam no Senhor renovam as forças. Deus não se cansa nem se fatiga — Ele dá poder aos fracos e vigor aos cansados.

bụ na matabeghị?

ga-abụ na nụbeghị ya?

Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,

Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.

naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.

O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.

na-enye ndị na-ada mba ike,

na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.

bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.

E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,

ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,

ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.

Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.

Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;

ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.

Onye nzọpụta ndị Izrel nwere

Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

bụ onye kere gị, Jekọb,

na onye kpụrụ gị Izrel,

"Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.

Akpọọla m gị aha, bụkwa nke m.

Mgbe si na mmiri dị omimi na-agafe,

aga m anọnyere gị.

Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,

agaghị m ekwe ka o bufuo gị.

Mgbe na-eje ije nʼime ọkụ,

gaghị eregbu gị.

Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.

Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,

Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.

Ewerela m Ijipt

na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.

Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Perseverança na fé

Não perca a confiança, pois ela tem grande recompensa. O justo viverá pela fé, e quem perseverar até o fim será salvo.

Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.

Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi. Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.

bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na dị. Na bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma bụrụ na anyị adaghị mba.

Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị.

Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs."

Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

Deus é refúgio

O Senhor é nosso refúgio e fortaleza. Ele ouve nossas orações, nos consola nas tribulações e transforma choro em dança.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ga-agba gị ume;

gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.

bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,

nʼihi na dịghị mgbe na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.

Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.

Onye ji ịkwa akwa

buru mkpụrụ ubi ga-agha na-aga,

ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,

mgbe ha bu ukwu ọka ha.

Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,

unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m

bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.

Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya,

bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya;

na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.

Vitória em Cristo

Jesus venceu o mundo e nos dá vitória. Para Deus nada é impossível, e Ele faz infinitamente mais do que pedimos ou pensamos.

"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."

Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.

Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, "Unu chọkwara iso ha pụọ?"

Saimọn Pita zara ya sị, "Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. Anyị kweere marakwa na bụ Onye Nsọ nke Chineke."

Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.

Rịọọnụ, chọọnụ, kụọnụ aka

"Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ."

Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."

Nʼihi na dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere."

Esperança e transformação

O Senhor completa a boa obra que começou em nós. Ele faz novas todas as coisas e dá esperança para o futuro.

Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.

Ya mere, bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.

Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, "Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala."

Onyenwe anyị dị mma.

bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.

na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu."

Permanecendo firme

Persevere na oração, firme-se na Palavra e fortaleça-se na graça de Cristo. A fé vem pelo ouvir, e o ouvir pela Palavra de Deus.

Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile. Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.

Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.

Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, "Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi," ka Onyenwe anyị kwuru.

Ma bụ ihe doro anya na bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.

Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.

Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume: ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.

Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs. Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.

Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.

Ma bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, na-anụ olu anyị. bụrụkwanụ na anyị matara na na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.

na-edi ihe niile, na-ekwerekwa ihe niile, na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.

Seja o primeiro