Publicidade

Jeremias 12

Mkpesa Jeremaya

1 Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị,

mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị.

Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị:

Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma?

Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?

2 Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ;

ha na-etokwa na-amị mkpụrụ.

Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha,

ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

3 Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị;

ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị.

Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu.

Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.

4 Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ?

Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ?

Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị

nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu.

Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị,

"Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị."

Ọsịsa Chineke nyere

5 "Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ

emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara,

i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi?

Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị,

ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?

6 Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị,

ararala gị nye.

Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị.

Atụkwasịla ha obi,

ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.

7 "Aga m agbakụta ụlọ m

na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ.

Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya

nyefee ya nʼaka onye iro ya.

8 Ihe nketa m aghọrọọla m,

ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa,

Ọ na-agbọ ụja megide m;

ya mere, m ji kpọọ ya asị.

9 Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị

nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m

nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?

Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,

mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

10 Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.

Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,

ha emeela ka ubi m mara mma

ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

11 Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;

e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.

Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,

nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.

12 Ndị mbibi ga-ejupụta

nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,

nʼihi na mma agha Onyenwe anyị

ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.

O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.

13 Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.

Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.

Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,

nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị."

14 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, "Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15 Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile. 16 Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m. 17 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi." Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-