Publicidade

Jeremias 30

Nlọta ụmụ Izrel

1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya. 2 "Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ. 3 Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru."

4 Ma ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Izrel na Juda. 5 "Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

" ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu,

nke oke egwu, ọ bụghị udo.

6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ,

nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ?

Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike

ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme,

ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?

7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ.

O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya.

Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb,

ma a ga-anapụta ya site na ya.

8 " ‘Nʼụbọchị ahụ,’

‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu,

tibisikwaa agbụ niile e kere ha.

Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha,

na Devid eze ha,

onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.

10 " ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.

Atụkwala ụjọ gị Izrel,’

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya,

zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya.

Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe.

Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.

11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi,

bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha,

agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam.

Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,

ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’

12 "Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara,

" ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta,

mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.

13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị,

o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa.

Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.

14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị;

ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha.

E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe;

ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ,

nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu,

mmehie gị dịkwa ọtụtụ.

15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ?

Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ?

Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị,

na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.

16 " ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị;

ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ.

Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike.

Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.

17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike;

aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ.

Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’

18 "Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

" ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya;

aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya.

A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;

ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele,

na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ.

Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ,

ha agaghị adịkwa ole na ole.

Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ,

ndị a na-agaghị eledakwa anya.

20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ,

nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m.

Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.

21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha;

onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta.

Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso,

nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam,

maka ịbịaru m nso?’

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m,

mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ "

23 Lee, Onyenwe anyị ga-esite nʼọnụma ya

mee ka oke ifufe ya fee.

Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu

dịka ifufe na-efesi ike.

24 Iwe ọkụ Onyenwe anyị agaghị akwụsị

tutu ruo mgbe o mezuru

ihe ndị o bu nʼobi.

Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa

unu ga-aghọta ihe ndị a.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-