Publicidade

Jeremias 23

Onyenwe anyị Ezi omume Anyị

1 "Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, "Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere." Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 3 "Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha." Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

5 "Ụbọchị ndị ahụ na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.

Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.

Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.

6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,

Izrel ga-ebikwa nʼudo.

Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:

Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.

7 "Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara, "mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ 8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha."

Ndị amụma ụgha.

9 Ma banyere ndị amụma,

obi m na-agbawa nʼime m,

ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.

Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,

dịka onye ṅụbigara mmanya oke,

nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,

na site nʼokwu nsọ ya.

10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.

Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,

ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.

Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.

Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.

11 "Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.

Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

12 "Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;

a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị

ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.

Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha

nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

13 "Ahụrụ m ihe arụ

nʼetiti ndị amụma Sameria:

Ha buru amụma site nʼike chi Baal,

si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.

14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya

nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.

Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.

Ha na-agba ndị ajọ omume ume,

si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.

Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;

ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m."

15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,

"Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,

meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,

nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem

gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ."

16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

"Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,

nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.

Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,

o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha

17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,

Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’

Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,

ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’

18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,

hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?

Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?

19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,

ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,

nke ga-abịa

bufuo ndị ajọ omume a.

20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya

tutu ruo mgbe o mezuru

ihe niile dị ya nʼobi.

Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,

unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.

21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,

ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.

O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,

ma ha nọkwa na-ebu amụma.

22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,

ha gaara ekwusara ndị m okwu m,

nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa,

sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.

23 "Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,

ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

24 "O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo

nke m na-enweghị ike ịhụ anya?"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

25 "Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi? 27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal. 28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?" Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 29 "Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?"

30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, "Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya. 31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’ 32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. "Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Ndị amụma ụgha na ịjụ ase ụgha.

33 "Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’ 34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ. 35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ 36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị. 37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’ 38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’ 39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha. 40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-