Publicidade

Jeremias 21

Chineke ajụ arịrịọ Zedekaya

1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia, 2 sị, "Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya."

3 Ma Jeremaya zara sị ha, "Gwanụ Zedekaya sị ya, 4 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a. 5 Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu. 6 Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha. 7 Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’

8 "Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. 9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10 Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’

11 "Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. 12 Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

" ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile;

napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha.

Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a.

Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu,

dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu,

ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.

13 Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem,

gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a,

onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Gị onye na-asị "Onye pụrụ ibuso anyị agha?

Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?"

14 Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị,

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile,

nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ "

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-