Publicidade

Jeremias 20

Jeremaya na Pashua

1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu, 2 o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, "Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu. 4 Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ. 5 Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn. 6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ "

Mkpesa Jeremaya

7 Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ.

I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ.

Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile.

Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.

8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu.

Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi.

Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala

m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.

9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, "Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ."

Ọ dịghị ekwe m.

Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi.

Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m.

Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya.

Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.

10 Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo,

"Oke egwu nʼakụkụ niile!

Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!"

Ndị enyi m niile

nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị,

"Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere,

mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya,

bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya."

11 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha;

nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m.

Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu;

a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.

12 Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume,

onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya,

biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha,

nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.

13 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ!

Nyenụ Onyenwe anyị otuto!

Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa,

site nʼaka ndị ajọ omume.

14 Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ.

Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.

15 Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m,

nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya,

"A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!"

16 Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ

o bibiri na-enweghị ọmịiko.

Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ,

na akwa ibu agha nʼehihie.

17 Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m,

hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m,

ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.

18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta

ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute,

na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-