Publicidade

Jeremias 31

1 "Nʼoge ahụ," otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, "Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m."

2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Ndị ahụ gbanarịrị mma agha

ga-ahụta ihuọma nʼọzara.

Aga m abịa iwetara Izrel izuike."

3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,

"Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;

Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.

4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,

e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ

soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.

5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige

nʼelu ugwu Sameria.

Ndị ọrụ ubi kụrụ ya

ga-erikwa mkpụrụ si na ya.

6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ

nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,

‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,

ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ "

7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,

tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.

Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,

Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,

bụ ndị Izrel fọdụrụ.’

8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;

aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.

Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,

na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.

Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!

9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,

ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.

Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,

nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,

nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,

Ifrem bụkwa ọkpara m.

10 "Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;

kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.

Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.

Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.

11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,

ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.

12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,

ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,

dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,

na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.

Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;

ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.

13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,

ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,

aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.

14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,

afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

"A nụrụ otu olu na Rema,

iru ụjụ na oke ịkwa akwa.

Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,

o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,

nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa."

16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,

jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,

nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị."

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.

17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

"Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.

18 "Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,

‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.

Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.

Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,

nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.

19 Mgbe m kpafuru,

echegharịrị m.

Mgbe m ghọtakwara,

e tiri m aka nʼobi m,

ihere mere m, ọ wutekwara m

nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’

20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,

onye ihe ya na-atọ m ụtọ?

Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,

ma anọkwa m na-echeta ya.

Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.

Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ."

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

21 "Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,

manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.

Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,

bụ okporoụzọ unu ga-eso.

Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,

laghachi nʼobodo gị ndị a.

22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,

gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?

Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;

nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu."

23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, "Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’ 24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha. 25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ."

26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.

27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, "Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda. 28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ." Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 29 "Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,

" ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,

ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’

30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.

31 "Lee, oge na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị

nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe ahụ m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,

ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

33 "Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba

mgbe oge ndị ahụ gasịrị," ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,

aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

"Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."

35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ

mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,

onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu

ka ha na-enye ihe nʼanyasị,

onye na-akpali oke osimiri,

na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.

Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,

ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,

ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ."

37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,

na ịdị omimi nke ntọala ụwa,

ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,

nʼihi ihe niile ha mere."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

38 "Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ. 39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa. 40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-