Pular para o conteúdo
Publicidade

Jeremaya 45

Ozi e ziri Baruk

1 Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị, 2 "Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk, 3 sịrị, Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.4 Ma ihe ndị a ka ga-agwa ya, Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala45:4 Maọbụ, nʼụwa a niile. 5 Ma gị onwe gị, na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ga-eje.45:5 Ị ga-agbapụ na ndụ ga nʼebe ọbụla ị ga-agbaga’ "

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também