Publicidade

Jeremias 8

1 " ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. 2 A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3 Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’

Mmehie na ahụhụ

4 "Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:

" ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?

Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?

5 Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?

Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?

Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;

ha jụrụ ịtụgharị.

6 Aṅaala m ntị,

ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.

O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,

"Gịnị bụ ihe a m mere?"

Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,

dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.

7 Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe

maara oge ya a kara aka.

Nduru, na eleke, na okwolo

makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.

Ma ndị m amaghị

ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.

8 " ‘Unu si aṅaa kwuo, "Ndị maara ihe ka anyị bụ,

nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,"

ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu

adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?

9 A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;

a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.

Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị,

ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?

10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha,

werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ.

Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,

ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.

Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja

na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.

11 Ha na-ekechi ọnya ndị m

dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.

Ha na-asị, "Udo dị, udo dị,"

mgbe udo na-adịghị.

12 Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile?

Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị;

nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere.

Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada;

ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ.

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

13 " ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara,

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị,

maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha.

Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ.

A ga-anapụkwa ha

ihe niile m nyere ha.’ "

14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?

Kwakọtaanụ ihe unu niile.

Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike

nọdụ nʼebe ahụ nwụọ!

Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.

O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,

nʼihi na anyị emehiela megide ya.

15 Anyị lere anya udo,

ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.

Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,

maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.

16 E sitere na Dan

nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.

Ala a niile mara jijiji

mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.

Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.

Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha

na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.

17 "Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.

Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.

Ana m ezibata ha ka ha taa unu."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,

nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.

19 Gee ntị nụrụ akwa ndị m

ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.

"Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?

Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?"

"Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,

na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?"

20 "Oge owuwe ihe ubi agafeela,

leekwa na ọkọchị agabigakwala,

ma a zọpụtabeghị anyị."

21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara.

Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.

22 Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead?

Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?

Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m

nʼihi mmerụ ahụ ha niile?

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_09-43-29-