Publicidade

Jeremias 49

Ozi e ziri banyere Amọn

1 Nke a dịrị ndị Amọn:

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom?

Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere?

Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad?

Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?

2 Ma ụbọchị ahụ na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha,

nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn.

A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe.

A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu.

Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa

ndị ahụ niile chụpụrụ ya."

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

3 "Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!

Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!

Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;

gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,

nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,

buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.

4 Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu

nke na-amị mkpụrụ hiri nne,

gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,

onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,

gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’

5 Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu

mee ka oke egwu bịakwasị gị,"

otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,

"A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.

Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.

6 "Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Ozi e ziri banyere Edọm

7 Nke dịrị Edọm:

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

"Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?

Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?

Amamihe ha o reela ure?

8 Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.

Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,

nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,

nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.

9 Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,

ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?

Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,

ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?

10 Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.

Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile

ka ọ ghara izobe onwe ya.

Ụmụ ya na ndị ikwu ya,

tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.

Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,

11 ‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.

Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ "

12 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, "Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ." 13 "Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi."

14 Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.

E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,

"Chịkọtaanụ onwe, megide ya.

Bilikwanụ maka ibu agha!"

15 Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,

ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.

16 Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,

na nganga nke obi gị eduhiela gị,

gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,

gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.

A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,

aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

17 "Edọm ga-aghọ ihe iju anya.

Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,

ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.

18 Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,

ya na obodo niile gbara ya gburugburu.

Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;

nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya," otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

19 "Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,

dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan

na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.

Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?

Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?

Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?"

20 Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,

nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.

A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,

ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.

21 Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;

iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.

22 Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa.

Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile.

Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm

ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.

Ozi e ziri banyere Damaskọs

23 Nke dịrị Damaskọs:

"Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,

nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.

Ha adaala mba,

nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.

24 Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ.

Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ,

ma ọma jijiji ejidela ya.

Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike,

dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.

25 Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,

bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?

26 Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,

a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ."

Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

27 "Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.

Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad."

Ozi e ziri banyere Keda na Hazọ

28 Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Bilienụ gaa buso Keda agha.

Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

29 A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.

A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,

ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.

Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,

‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’

30 "Gbalaganụ ọsịịsọ.

Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,"

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu,

o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.

31 "Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha,

bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,"

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya,

mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.

32 Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha,

ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha.

Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha.

Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

33 "Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa.

Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.

O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ,

nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya."

Ozi banyere Ilam

34 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.

35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

"Lee, aga m agbaji ụta nke Elam,

bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.

36 Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ,

nke ga-abịa megide Elam.

Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a,

ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche,

ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.

37 Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha,

e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike.

Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha,

meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

"Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ

tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.

38 Aga m edo ocheeze m nʼElam,

bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

39 "Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,

aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-