Publicidade

Jeremias 22

Ikpe ọmụma dịrị ndị eze ọjọọ

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, "Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a. 2 ‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. 3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. 4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. 5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ "

6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,

"Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,

dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,

aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,

dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.

7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.

Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.

Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,

tụnye ha niile nʼime ọkụ.

8 "Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ 9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ "

10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,

kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.

Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;

ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.

11 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, "Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. 12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ."

13 "Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,

nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,

onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,

nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.

14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,

nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’

Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,

jirikwa osisi sida machie elu ya,

werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.

15 "Ị ga-abụ eze

nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?

Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?

O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi

nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.

16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,

nke a mere na ihe niile gara nke ọma.

Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?

Ka Onyenwe anyị kwupụtara

17 Ma anya unu na obi unu

adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi

nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,

na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere."

18 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:

"Ha agaghị eruru ya uju sị,

‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’

Ha agaghị eruru ya uju sị,

‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’

19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.

A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya

nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem."

20 "Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,

meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,

sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa

nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.

21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,

ma ị jụrụ ige ntị.

Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.

Ị jụkwara irubere m isi.

22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,

a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.

Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala

nʼihi ajọ omume gị niile.

23 Gị onye na-ebi na Lebanọn,

onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,

lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,

ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.

24 "Ma dịka m na-adị ndụ," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, "a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, 25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa. 26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ. 27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya."

28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,

ihe onye ọbụla na-achọghị?

Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,

tụga ha na mba ha na-amaghị?

29 Ala, ala, ala,

nụrụ okwu Onyenwe anyị.

30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru:

"Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,

nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,

nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,

o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,

maọbụ chịakwa ọzọ na Juda."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-