Publicidade

Jeremias 47

Ozi e ziri banyere ndị Filistia

1 Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.

2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

"Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu;

ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke.

Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya,

ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya.

Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa,

mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.

3 Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ,

mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro,

na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha.

Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka,

nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.

4 Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala

mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,

mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,

ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.

Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,

o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.

5 Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.

A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.

Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,

unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?

6 " ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,

ole mgbe ị ga-ezu ike?

Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,

kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’

7 Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,

ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu

ibu agha megide Ashkelọn,

na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?"

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-