Publicidade

Não temas

Por Bíblia Online

'Não temas' é uma das frases mais repetidas na Bíblia. Deus a pronuncia nos momentos de maior temor, lembrando que sua presença e poder são maiores que qualquer ameaça.

Deus está contigo

Não temas, porque eu sou contigo. Deus repete essa promessa em cada crise, guerra e desafio que seus filhos enfrentam.

Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.

Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.

Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;

aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.

Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,

onye na-ejidesi aka nri gị ike

bụ onye na-asị gị, Atụla egwu;

aga m enyere gị aka.

Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,

unu Izrel dị nta, atụla egwu,

nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka," otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.

Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,

rigoro nʼelu ugwu;

gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,

welie olu gị elu tisie mkpu ike;

e, tisie mkpu ike, atụla egwu.

Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:

"Chineke unu na-abịa."

bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla na-aga."

Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. gaghị agbakụta unu azụ, gakwaghị ahapụ unu."

Ọgbụgba Ndụ Chineke na Ebram

Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya,

"Atụla egwu, Ebram

Abụ m ọta gị,

ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere."

Coragem diante do perigo

Não tenhas medo — o Senhor teu Deus está no meio de ti, poderoso para salvar. Ele luta por nós e dá forças aos medrosos.

Nʼụbọchị ahụ,

ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,

"Atụla egwu, gị Zayọn,

ekwela ka aka gị daa mba.

Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,

bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.

ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;

nʼihi ịhụnanya ya, gaghị abakwara gị mba,

kama ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe nọ."

Ma Ịlaisha zara sị ya, "Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha."

Mgbe ahụ, Ịlaisha kpere ekpere sị, "Onyenwe anyị, biko, saghee anya ya abụọ ka hụ." Onyenwe anyị meghere anya ohu Ịlaisha, mee ka hụ ịnyịnya ọkụ, na ụgbọala ọkụ jupụtara nʼugwu dị gburugburu ebe ahụ niile.

Atụkwala egwu, gị ala Juda,

kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,

nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.

Ma Onyenwe anyị sịrị m, "Asịkwala Abụ m naanị nwantakịrị,nʼihi na ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu. Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị," bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.

Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, "Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị. Nʼihi na anọnyeere m gị. dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a."

Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.

Fé que vence o medo

O medo não vem de Deus. Jesus disse: não temas, crê somente! A fé dissipa o medo e nos conecta ao poder de Deus.

Ma ka nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, "Atụla egwu, naanị kwere."

Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.

Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.

Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.

Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, "Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.

Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, dara nʼukwu Jisọs sị, "Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie."

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-