Publicidade

Nova aliança

Por Bíblia Online

A Nova Aliança é o pacto de graça que Deus estabeleceu através de Jesus Cristo. Diferente da antiga, ela é escrita no coração, mediada pelo sangue de Cristo e acessível a todos.

A profecia da Nova Aliança

Jeremias profetizou uma aliança nova em que Deus escreveria sua lei no coração do povo. Essa promessa se cumpriu em Cristo.

"Lee, oge na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,

"mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị

nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe ahụ m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,

bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba

mgbe oge ndị ahụ gasịrị," ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,

aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, Mara Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

"Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."

Ma otu dị, natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.

bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ.

Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma.

Selada com sangue

Jesus instituiu a Nova Aliança na Última Ceia: 'Este cálice é a nova aliança no meu sangue.' Seu sacrifício é definitivo e perfeito.

Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, "Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu.

Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.

Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.

Nʼihi nke a, bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.

bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ nwụọla. Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ. bụ nke a mere bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya. Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile. Na-ekwu, "Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu."

Kraịst chụrụ aja naanị otu ugboro

Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke. Ma bụghị otu a, bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha. Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile. Nʼihi na bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.

Reconciliação e vida nova

Pela Nova Aliança somos reconciliados com Deus, trazidos para perto pelo sangue de Cristo e feitos embaixadores da reconciliação.

Ya mere, bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. Ma bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.

Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ. dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke. Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.

Ịbụ otu anyị nʼime Kraịst

Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na "ndị e biri ugwu" na-akpọkwa unu "ndị a na-ebighị ugwu" (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie). Nʼoge ahụ, dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.

Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-