Órfãos
Deus tem um cuidado especial pelos órfãos. Ele se apresenta como pai dos que não têm pai e defensor dos desamparados, e ordena a seu povo que faça o mesmo.
Deus, pai dos órfãos
O Senhor é pai dos órfãos e protetor das viúvas. Ele sustenta os que perderam amparo humano e cuida deles com ternura.
Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,
toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,
Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa,
na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ,
ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.
Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;
hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
O chamado da justiça
A religião pura é visitar órfãos e viúvas em suas aflições. Deus ordena a defesa do necessitado e o cuidado com os mais frágeis.
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,
nyerenụ ndị a na-emegbu aka.
Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,
ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
"Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko. Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
"Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.
Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.