Pais
Deus é nosso Pai celestial — amoroso, provedor, disciplinador e fiel. As Escrituras também honram os pais terrenos e os chamam a criar os filhos na instrução do Senhor.
O Pai celestial
Deus é Pai de misericórdias. Ele nos adotou como filhos, nos ama incondicionalmente e cuida de cada detalhe da nossa vida.
Ibi ndụ dị ka ụmụ Kraịst
Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
Ibi ndụ dị ka ụmụ Kraịst
Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ "Abba, Nna." Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,
ọ na-echeta na anyị bụ aja.
Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.
Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị,
a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị
maọbụ Izrel agọnarị anyị,
gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị,
onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,
e nyekwala anyị otu nwa nwoke.
Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.
Ndị a ga-abụ aha ya,
Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,
Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,
e nyekwala anyị otu nwa nwoke.
Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.
Ndị a ga-abụ aha ya,
Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,
Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
O cuidado paterno de Deus
O Pai celestial sabe do que precisamos antes de pedirmos. Ele dá boas dádivas aos filhos que pedem e cuida até dos passarinhos.
Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị. Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.
Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
"Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya."
"Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ.
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya?
Conhecer o Pai
Jesus é o caminho para o Pai. Ninguém conhece o Pai senão o Filho e aquele a quem o Filho quiser revelar.
Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?
Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m."
Jisọs zara sị ya, "Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri.
Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m. Mụ na nna m bụ otu."
"Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.
"Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.
"Unu ekwela ka onye ọbụla kpọọ unu ‘Onye ozizi,’ nʼihi na unu nwere naanị otu Onye ozizi. Unu niile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe.
I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?
Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere.
Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Disciplina e amor paterno
O Pai disciplina os filhos que ama. A correção divina produz fruto de justiça e paz para aqueles que foram exercitados por ela.
Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.
Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,
ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,
ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
Pais terrenos
A Bíblia honra os pais que criam os filhos nos caminhos de Deus. Honrar pai e mãe é mandamento com promessa de vida longa.
Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.
Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;
ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya
ka Chineke na-afụnyụ.
Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,
otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ
onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.
Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro
na-arụrịta ụka nʼama.
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.
Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a,
nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.
Ana m edere unu ụmụ okorobịa,
nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
Ana m edere unu ụmụntakịrị,
nʼihi na unu maara nna ahụ.
Ana m edere unu ndị nna,
nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.
Ana m edere unu ụmụ okorobịa,
nʼihi na unu siri ike,
okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu,
unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
Unu ahụla ụwa nʼanya
Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.