Pular para o conteúdo
Publicidade

Relacionamentos

Por Bíblia Online

Os relacionamentos são centrais na vida cristã. A Bíblia orienta sobre amizade, casamento, família e convivência, sempre tendo o amor como fundamento de toda relação.

Amor e amizade

O amigo ama em todo tempo. A Bíblia valoriza amizades verdadeiras que edificam, fortalecem e desafiam ao crescimento mútuo.

Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.

Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.

Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka dị nkọ,

otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.

Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,

nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

Otu onye nʼime ha daa,

onye nke ọzọ ga-apalite ya.

Ma mgbe bụ naanị otu onye,

onye ga-apalite ya? nọ nʼime nsogbu.

bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,

ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.

Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.

Casamento e família

O casamento é aliança sagrada. O marido deve amar a esposa como Cristo amou a Igreja, e ambos devem cultivar respeito e submissão mútua.

Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka dị ọcha.

Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.

Ma otu dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.

Okwu dịrị ezinaụlọ ndị nke Kraịst

Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.

Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, "dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya."

Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.

Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,

ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.

Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?

dị oke ọnụ karịa nkume rubi.

mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,

dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ.

Convivência saudável

Os relacionamentos florescem quando tratamos os outros como gostaríamos de ser tratados, com amor crescente e caráter maduro.

Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.

Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị."

Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ.

Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.

Ndị Kraịst na ndị na-ekweghị ekwe

Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?

Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.

Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.

Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,

ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.

Seja o primeiro