Descansar no Senhor
Descansar no Senhor é um ato de fé. Em um mundo agitado, Deus nos convida a entregar nossas ansiedades, aquietar o coração e confiar plenamente em sua provisão e cuidado.
O convite ao descanso
Jesus convida os cansados e sobrecarregados a irem a Ele e encontrar descanso para as suas almas. O jugo dele é leve.
"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ."
Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,
were ndidi chere ya;
echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,
mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Ọ na-asị, "Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa."
Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
Confiança e paz
Quem confia no Senhor encontra paz perfeita. A ansiedade perde o poder quando entregamos tudo nas mãos do Deus soberano.
Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike
nwee udo zuruoke,
nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,
"Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,
na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,
ma unu ekweghị na nke ọbụla.
Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo;
ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Esperar no Senhor
Esperar no Senhor renova as forças. A Bíblia nos ensina que aquietar-se diante de Deus e confiar em seu tempo é marca da maturidade espiritual.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
Maanụ jijiji, unu emehiekwala;
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela
Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
A fidelidade de Deus
Deus é fiel. Seus planos são de paz e esperança. Podemos descansar sabendo que Ele guarda e sustenta quem nele confia.
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi. Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
"Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ."
Ọ zara sị, "Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike."
Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
Nʼihi nke a, ọ gwara ndị Juda sị ha, "Ugbu a ka anyị kwesiri iwu obodo ndị a. Ka anyị wuokwa mgbidi gburugburu ha, wuokwa ụlọ elu nche, tinyesịa ha niile ibo ọnụ ụzọ ama, na mkpọrọ e ji akpọchi ya, ala a bụ nke anyị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye anyị ji obi anyị chọsie ike enyela anyị udo." Ya mere, ha wuru ihe ndị a niile nwekwa ọganihu.
Ka ha na-arịda na-abịaru nsọtụ obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl, "Gwa onyeozi ahụ ka ọ gafee nʼihu anyị." Onyeozi ahụ mekwara otu a, ma, "Gị onwe gị chere ntakịrị oge nʼebe a ka m mee ka ị nụrụ ozi sitere nʼaka Chineke."