Sabedoria
A sabedoria é um dos temas mais ricos da Bíblia. O temor do Senhor é seu princípio, e buscá-la vale mais que ouro ou prata. Deus promete dar sabedoria generosamente a quem pedir com fé.
O princípio da sabedoria
O temor do Senhor é o início de toda sabedoria verdadeira. Quem reverencia a Deus aprende a viver com discernimento e prudência.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;
onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?
Olee kwa ebe nghọta bi?
Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,
agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
Ogbu mmiri na-asị, "Ọ dịghị nʼime m,"
osimiri na-asị, "Ọ dịghị nʼaka m."
A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,
apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,
a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,
maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;
ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;
a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
Olee ebe amamihe si abịa?
Olee ebe nghọta bi?
E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,
e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
Mbibi na ọnwụ na-asị;
"Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị."
Sabedoria como dom de Deus
A verdadeira sabedoria vem do alto. Deus a concede generosamente a quem pede com fé, sem lançar em rosto a fraqueza humana.
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;
nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;
nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,
ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị
chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha,
nʼihi na i nyela m amamihe na ike.
I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị,
i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ."
Daniel sịrị,
"Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
amamihe na ike dị nʼaka ya.
Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
A sabedoria do alto
A sabedoria que vem de Deus é pura, pacífica, amável, cheia de misericórdia e de bons frutos. Ela se opõe à sabedoria terrena e mundana.
Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
Ụdị amamihe abụọ dị
Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.
Amamihe Chineke
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto.
Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe.
Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe.
Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya. Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị.
Direção e discernimento
Deus guia os humildes na justiça e ensina seu caminho aos mansos. Ele promete dirigir nossos passos quando confiamos nele de todo o coração.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.
Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,
na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,
kuzikwaara m ụzọ gị niile.
Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,
nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,
olileanya m dị na gị.
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,
nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.
Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,
nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
Kuziere m ime uche gị,
nʼihi na ị bụ Chineke m;
ka ezi Mmụọ gị
duo m nʼala dị larịị.
O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m;
nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;
duo m nʼụzọ kwesiri
nʼihi ndị na-akpagbu m.
A Palavra como fonte de sabedoria
A Palavra de Deus é lâmpada para os pés e luz para o caminho. Meditar nas Escrituras nos dá entendimento superior ao dos mestres.
Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m
bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m
bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
Kpughee anya m abụọ
ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.
Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;
ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
Onye ihe na-agara nke ọma
Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
Sabedoria prática para o dia a dia
A sabedoria se aplica em cada decisão: nas finanças, nos relacionamentos, no trabalho e no uso do tempo. Vivamos como sábios, não como insensatos.
Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.
Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.
Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.
Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.
Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;
ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ,
nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.
Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,
ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
Nganga na-eweta esemokwu,
ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.
Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,
ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,
ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,
ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,
nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị,
gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma. Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.
O valor da sabedoria
A sabedoria é mais preciosa que rubis. Quem a encontra, encontra a vida e alcança o favor do Senhor. Nada se compara a ela.
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,
onye nwetara nghọta.
nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;
ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,
maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,
ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
Amamihe bụ ndo
dịka ego si bụrụkwa ndo,
ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:
Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
Asịla, "Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?"
Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.
Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.
A sabedoria e a soberania de Deus
Os caminhos de Deus são mais altos que os nossos. Sua sabedoria é insondável, eterna e infinitamente superior ao entendimento humano.
"Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,
otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.
"Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,
ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,"
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya
ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,
meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.
Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-atụkwasị Ijipt obi
Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,
ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,
ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,
ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.
Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;
ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.
Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.
Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.
Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;
ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.
Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,
onye nzube ya dị ịtụnanya,
onye amamihe ya dị ebube.
Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya,
inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta,
Mmụọ ndụmọdụ na ike,
Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị.
Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ,
maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,
meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.
Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,
dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
Ekele dịrị Chineke
Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu!
Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile,
ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.
Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.
Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.
Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.
Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;
nghọta ya enweghị nsọtụ.
Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,
ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
nʼihi ndị iro m;
mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m.
Ekpere Jeremaya
O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,
na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
Anyala isi banyere echi,
nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị, ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
Ịdọ aka na ntị ikpeazụ
Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.
Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,
"Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ
maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.
Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị."
Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.
Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.
Ihe iso Jisọs Pụtara
"Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume.
Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi."
Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa;
ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?
Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
"Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,
ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
Okwu Job
Job zara sị:
"Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.
Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,
ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,
onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.
Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,
Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,
na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
Ọ gwara ha si, "Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.
Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.