3 Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. 4 Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. 5 O gosiri Sefas15:5 Ya bụ, Pita onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. 6 Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.
Publicidade