Publicidade

1 Coríntios 15

54 Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, "Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile."15:54 Aịz 25:8

55 "Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị?

Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?"15:55 Hos 13:14

56 Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. 57 Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-