14 Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.2:14 Mmụọ nʼebe a, na-ekwu banyere Mmụọ nke si na Chineke. 15 Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta. 16 Nʼihi na,
"Onye maara uche Onyenwe anyị
ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?"2:16 Aịz 40:13
Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.