1 Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ? 2 Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu? 3 Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a? 4 Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya? 5 Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya?
Publicidade
1 Coríntios 6
Ọ dị njọ ịga nʼụlọikpe