16 Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.
Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. 17 Nʼụzọ dị otu a, a na-eme ka ịhụnanya zuo oke nʼetiti anyị, ka anyị nwee ike inwe nkwuwa okwu nʼụbọchị ikpe ahụ, nʼihi na dịka ya onwe ya dị, otu a ka anyị onwe anyị dịkwa nʼụwa nke a. 18 Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.