Iso Kraịst ga-eweta ihe mgbu
1 Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. 2 Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. 3 Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. 4 Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu. 5 Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.