Ndụmọdụ Devid nyere Solomọn
1 Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
2 "Oge ọnwụ m eruola," ka ọ sịrị, "Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke. 3 Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị. 4 Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’