Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Ndị Eze 2

Ndụmọdụ Devid nyere Solomọn

1 Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,

2 "Oge ọnwụ m eruola," ka sịrị, "Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke. 3 Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile na-eme, nʼebe ọbụla na-eche ihu gị. 4 Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.

Veja também