19 Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze2:19 Nʼụlọeze mba ndị dị nʼọwụwa anyanwụ, nne eze bụ onye a na-asọpụrụ. A na-enyekwa ya ọrụ ụfọdụ ka ọ rụọ, i ji kwanyere ya ugwu. ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
20 Ọ sịrị, "Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya."
Eze zaghachiri, "Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya."