Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Ndị Eze 5

13 Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ. 14 Nʼotu ọnwa, na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram5:14 1Ez 12:18 bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a. 15 Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ. 16 Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.

Veja também