Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Samuel 1

10 Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 11 O kwere nkwa sị, "O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụrụ na ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla."

12 Mgbe nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ. 13 Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na bụ nwanyị mmanya na-egbu. 14 Elayị sịrị ya, "Ruo ole mgbe ka ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!"

15 Ma Hana zara sị ya, "Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi. 16 Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m."

17 Elayị zara sị ya, "Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị."

18 Hana zara sị, "Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma." O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.

19 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya. 20 Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. gụrụ ya Samuel, nʼihi na sịrị, "Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya."

Veja também