Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Samuel 27

Devid ebiri nʼetiti ndị Filistia

1 Devid chere nʼime onwe ya sị, "Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya."

2 Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat. 3 Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal. 4 dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya kwụsịrị ịchụso ya.

5 Devid gwara Akish sị ya, "bụrụ na m anatala amara nʼebe nọ, ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?"

6 Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa. 7 Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.

8 Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt) 9 Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, na-alọghachikwuru Akish.

10 bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, "Ndị ole ka unu busoro agha taa?" Devid ga-aza sị, "bụ ndị bi na ndịda Juda", maọbụ "ndị ndịda Jerahmel", maọbụ "ndị ndịda Ken."27:10 Ndị Jerahmel bụ ụmụ ụmụ Juda site na nwa nwa ya bụ Hezrọn, 1Ih 2:5,9,25 gụọ ihe banyere ndị Ken nʼihe e depụtara nʼakwụkwọ. Nkp 4:11 11 Ma dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, "Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, Otu a ka Devid mere.’ " Otu a ka na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia. 12 Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, "Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também