Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Samuel 17:4,33,37,40,45,49

4 Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat,17:4 Golaịat bụ onye si nʼagbụrụ ndị Anak, ndị Joshua kpochapụrụ nʼala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, Ashkelọn na Gat. Jos 11:21-22 onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.

33 Ma Sọl zaghachiri, "Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa."

37 Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!"

Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, "Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị."

40 Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.

45 Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, "I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.

49 Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.