Devid nʼobodo Gat
10 Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat. 11 Ma ndị ozi Akish sịrị ya, "Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị:
" ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya,
Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?"
12 Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya. 13 Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
14 Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, "Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya? 15 Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?"