Ekele mmechi
11 Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
12 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
13 Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu.
14 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.